11 N’ihi ya, Jehova mere ka ndị isi agha eze Asiria bịa lụso ha agha. Ha jidekwara Manase, ganye nko n’ahụ́ ya,* tụọkwa ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụga ya Babịlọn.
13 Ọ nọkwa na-ekpe ekpere, na-arịọ Chineke ka o meere ya amara, ya anabata arịrịọ ya, mee ka ọ laghachi Jeruselem, chịwakwa.+ Oge ahụ ka Manase matara na Jehova bụ ezi Chineke.+