-
2 Ihe E Mere 2:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Solomọn wee gụọ ụmụ nwoke niile bụ́ ndị mbịarambịa bi n’Izrel ọnụ,+ otú ahụ Devid nna ya gụrụ ndị mmadụ ọnụ.+ Ọ gụtara otu narị puku mmadụ na puku iri ise na atọ na narị mmadụ isii (153,600). 18 Ọ gwaziri puku mmadụ iri asaa (70,000) n’ime ha ka ha na-arụ ọrụ ndị nkịtị na-arụ,* gwa puku iri asatọ (80,000) ka ha na-awa nkume+ n’ugwu, gwakwa puku mmadụ atọ na narị isii (3,600) ka ha na-elekọta ndị ọrụ, hụkwa na ha na-arụ ọrụ ha.+
-