11 Jehova, ị bụ onye ukwu.+ Ị dịkwa ike.+ Ị bụ onye ọma, dịrịkwa ebube.+ E kwesịrị ịna-asọpụrụ gị n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị.+ Jehova, ọ bụ gị bụ eze.+ Ị na-egosikwa na ọ bụ gị bụ Ọkaakaa.
17 Ọ bụ ndị nche nyere iwu a,+ ọ bụkwa ihe ndị nsọ kwuru ka e mee, ka ndị dị ndụ wee mara na ọ bụ Onye Kacha Elu na-achị n’alaeze ndị mmadụ.+ Ọ bụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ na-eme ka ọ chịwa, ọ na-emekwa ka onye kacha ala ná ndị mmadụ chịwa na ya.”