-
2 Samuel 23:5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
A haziri ihe niile gbasara ọgbụgba ndụ a ahazi. Aka agaghịkwa akpa ya.
Ọ bụ ya ga-eme ka nzọpụta m zuo okè. Ọ bụkwa ya bụ isi ọṅụ m.
Ọ bụ ya mere o ji eme ka ihe na-agaziri ezinụlọ m.+
-
-
Jeremaya 33:20, 21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 “Mụnwa bụ́ Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike imebi ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na ọgbụgba ndụ m nke na-achị abalị, ka a ghara inwe ehihie na abalị n’oge ha,+ 21 maranụ na e nwekwara ike imebi ọgbụgba ndụ mụ na Devid bụ́ ohu m,+ a gharazie inwe nwa ya ga-anọ n’ocheeze ya na-achị,+ nweekwa ike imebi ọgbụgba ndụ mụ na ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà, ndị na-ejere m ozi.+
-