-
2 Ndị Eze 8:20-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Ọ bụ n’oge Jehoram na-achị ka ndị Ịdọm nupụụrụ Juda isi,+ nwee eze nke ha.+ 21 Jehoram na ndị agha ya wee jiri ụgbọ ịnyịnya ya niile gaa Zea. O bilikwara n’abalị lụso ndị Ịdọm gbara ya na ndị isi na-agba ụgbọ ịnyịnya ya gburugburu agha, meriekwa ha. Ndị agha ahụ gbalakwara n’ụlọikwuu ha. 22 Ma Ịdọm ka na-enupụrụ ndị Juda isi ruo taa. N’oge ahụ, ndị Libna+ nupụkwaara ha isi.
-