-
2 Ndị Eze 12:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Jehoash wee sị ndị nchụàjà: “Chịkọtanụ ego niile a na-eweta n’ụlọ Jehova ka ha bụrụ onyinye dị nsọ,+ ma ụtụ onye ọ bụla kwesịrị ịtụ,+ ma ego ndị nchụàjà na-anata onye* kwere nkwa, ma ego onye nke ọ bụla si n’obi ya weta n’ụlọ Jehova.+ 5 Ndị nchụàjà ga-anata onye ọ bụla ego o wetara,* ka e jiri ya rụzie ebe ọ bụla mebiri emebi*+ n’ụlọ nsọ.”
-
-
2 Ihe E Mere 34:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ha gakwuuru Hilkaya bụ́ nnukwu onye nchụàjà, nye ya ego e wetara n’ụlọ Chineke. Ọ bụ ndị Livaị ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ahụ nche natara ego ahụ. Ha natara ya ndị ebo Manase, Ifrem, na ndị Izrel ndị ọzọ+ nakwa ndị ebo Juda, Benjamin, na ndị bi na Jeruselem. 10 E nyeziri ndị a họpụtara ka ha na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova ego ahụ. Ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ Jehova jizi ya rụzie ụlọ ahụ.
-