17 Mgbe Jehoyada nwụchara, ndị isi ndị Juda batara kpọọrọ eze isiala. Eze gekwara ha ntị, mee ihe ha gwara ya. 18 Ha hapụrụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha, malite ife arụsị na ogwe osisi arụsị. Mmehie a ndị Juda na ndị Jeruselem mere mere ka Chineke wesa ha iwe.