10 Ọ rụkwara ụlọ nche+ n’ala ịkpa, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri (n’ihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ). O mekwara otú ahụ na Shefila nakwa n’ala dị larịị. O nwere ndị ọrụ ubi na ndị na-arụ ọrụ n’ubi vaịn dị n’ugwu nakwa na Kamel, n’ihi na ọrụ ubi na-amasị ya.