15 N’ihi ya, Hezekaya nyere ya ọlaọcha niile dị n’ụlọ Jehova nakwa ndị nke dị n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ eze.+ 16 N’oge ahụ, Hezekaya eze Juda wepụtara ibo ụzọ ndị dị n’ụlọ nsọ+ Jehova, wepụtakwa awara ụzọ ndị yanwa ji ọlaedo machie,+ buru ha bunye eze Asiria.