14 Ndị Livaị hapụrụ ala ha nakwa ala anụmanụ ha na-ata ahịhịa+ bịa na Juda nakwa na Jeruselem, n’ihi na Jeroboam na ụmụ ya kwụsịrị ha ịrụ ọrụ ndị nchụàjà ha na-arụrụ Jehova.+
16 Ndị ji obi ha niile na-achọ Jehova bụ́ Chineke Izrel si n’ebo niile n’Izrel soro ndị nchụàjà na ndị Livaị bịa Jeruselem ịchụrụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha àjà.+