9 Ozugbo e mechara ihe ndị a, ndị isi bịakwutere m, sị: “Ndị Izrel na ndị nchụàjà na ndị Livaị ka so ndị bi n’ala ndị a na-emekọ ihe, sorokwa ha na-eme omume rụrụ arụ ndị ha na-eme,+ ya bụ, ndị Kenan, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Jebus, ndị Amọn, ndị Moab, ndị Ijipt,+ na ndị Amọraịt.+