-
Daniel 4:34, 35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 “Mgbe oge ahụ gwụrụ,+ mụnwa, bụ́ Nebukadneza, leliri anya n’eluigwe, anya wee doo m. M wee too Onye Kacha Elu. M toro Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, jaakwa ya mma, n’ihi na ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi, alaeze ya na-adịkwa malite n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+ 35 E nweghị ihe ndị niile bi n’ụwa bụ ma e were ha tụnyere ya, ọ na-emekwa ihe bụ́ uche ya n’ebe ndị bi n’eluigwe na ndị bi n’ụwa nọ. E nweghịkwa onye ga-egbochili ya ime ihe ọ bụla+ ma ọ bụ sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a i mere?’+
-