30 Filip wee gbara ọsọ gaa n’akụkụ ụgbọ ahụ ma nụ ka nwoke ahụ na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Filip asị ya: “Ị̀ na-aghọta ihe ị na-agụ?” 31 Ya asị: “Olee otú m ga-esi ghọta ihe m na-agụ ma ọ bụrụ na o nweghị onye kọwaara m ya?” O wee gwa Filip ka ọ rịgota soro ya nọdụ ala.