Diuterọnọmi 28:15 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 15 “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+ Diuterọnọmi 28:33 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 33 Ndị unu na-amaghị ga-eri ihe ala unu mepụtara na ihe niile unu rụtara.+ A ga na-erigbu unu mgbe niile, na-echikwa unu ọnụ n’ala. Nehemaya 5:4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 4 Ndị ọzọ nọkwa na-asị: “Anyị ejirila ugbo anyị na ubi vaịn anyị gbaziri ego anyị ji tụọ ụtụ eze.+
15 “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+
33 Ndị unu na-amaghị ga-eri ihe ala unu mepụtara na ihe niile unu rụtara.+ A ga na-erigbu unu mgbe niile, na-echikwa unu ọnụ n’ala.