5 E nwere otu nwoke onye Juu nọ na Shushan,+ bụ́ ebe obí eze dị. Aha ya bụ Mọdekaị.+ Ọ bụ nwa Jeya nwa Shimiaị nwa Kish, onye ebo Benjamin.+ 6 O so ná ndị e si na Jeruselem dọrọ n’agha mgbe Nebukadneza eze Babịlọn dọọrọ Jekonaya+ bụ́ eze Juda n’agha.