-
Jenesis 41:42, 43Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
42 Fero wee gbapụta mgbaaka o ji aka ihe akara gbanye ya Josef n’aka ma yiwe ya ezigbo uwe e ji ákwà linin kpaa, nyawakwa ya ihe olu ọlaedo n’olu. 43 O nyekwara ya ụgbọ ịnyịnya ya nke abụọ kacha mma ka o jiri ya gbagharịa. Mgbe ọ nọ n’elu ụgbọ ịnyịnya ahụ, ndị mmadụ nọ na-eti mkpu n’ihu ya, sị, “Avrek!”* Fero si otú a mee ya onyeisi n’ala Ijipt niile.
-