28 Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya+29 wee pụta. Ndị mere ezi ihe ga-esi n’ọnwụ bilie ka ha dị ndụ,* ma ndị mere ihe ọjọọ ga-esi n’ọnwụ bilie ka e kpee ha ikpe.*+
43 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o kwuziri n’oké olu, sị: “Lazarọs, pụta!”+44 Nwoke ahụ nwụrụ anwụ wee pụta. E kere ya ákwà n’ụkwụ na n’aka, jirikwa ákwà kechie ya ihu. Jizọs sịrị ha: “Tọpụnụ ya ákwà ka ọ lawa.”