-
Joshụa 3:15, 16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ozugbo ndị nchụàjà bú Igbe ahụ ruru n’Osimiri Jọdan, ụkwụ ha azọnyekwa n’ọnụ ọnụ ya (Osimiri Jọdan na-etoju n’ọnụ+ n’oge a na-ewe ihe ubi), 16 mmiri si n’ebe mgbago na-asọdata kwụsịrị ịsọ asọ. O toro, kwụrụkwa otu ebe ka mgbidi, si ebe ahụ ruo Adam dị ezigbo anya. Obodo a dị nso na Zaretan. Ma, mmiri nke na-asọga n’Oké Osimiri Araba, ya bụ, Oké Osimiri Nnu, tara. Ha kwụsịrị ịsọ asọ, ndị Izrel esi n’ihu Jeriko gafee.
-