3 Ana m arịọkwa gị, ezigbo onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ,* ka ị na-enyere ụmụ nwaanyị ndị a aka. N’eziokwu, mụ na ha na Klement nakwa ndị ọzọ gbakọrọ mbọ ọnụ n’izisa ozi ọma. Aha ha niile dị n’akwụkwọ nke ndụ.+
5 Onye meriri n’agha+ ga-esi otú ahụ yiri uwe na-acha ọcha.+ M gaghịkwa ehichapụ aha ya n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwu n’ihu Nna m na n’ihu ndị mmụọ ozi ya na m ma aha ya.+
8 Ndị niile bi n’ụwa ga-efekwa ya. Malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa, o nweghị onye n’ime ha e dere aha ya n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ+ nke Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu.+