35 N’oge ahụ, e gweriri ígwè ahụ, ụrọ ahụ, ọla kọpa ahụ, ọlaọcha ahụ, na ọlaedo ahụ. Ha niile wee dịrị ka mkpo ọka ndị dị n’ebe a na-azọcha ọka n’oge okpomọkụ. Ifufe wee buru ha bufuo, a hụghịzi ha ọzọ. Ma nkume ahụ nke kụriri ihe ahụ a kpụrụ akpụ ghọrọ nnukwu ugwu, gbasaakwa n’ebe niile n’ụwa.