-
Diuterọnọmi 6:21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 ị ga-agwa nwa gị, sị, ‘Anyị nọ na-agbara Fero ohu n’Ijipt, ma Jehova ji aka ya dị ike kpọpụta anyị n’Ijipt.
-
-
Diuterọnọmi 11:18, 19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 “Meenụ ka okwu ndị a m na-agwa unu bamie n’obi unu nakwa ná mkpụrụ obi* unu. Keekwanụ ha n’aka unu ka unu wee na-echeta ha. Ha ga-adị ka ihe unu na-ekegide n’egedege ihu unu.*+ 19 Kụzierenụ ha ụmụ unu. Na-ekwunụ banyere ha mgbe unu nọ ọdụ n’ụlọ unu na mgbe unu na-aga ije n’okporo ụzọ na mgbe unu dina ala nakwa mgbe unu biliri ọtọ.+
-
-
Joshụa 4:6, 7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Nkume ndị a ga na-echetara unu ihe Chineke mere. Ọ bụrụ na ụmụ unu ajụọ unu n’ọdịnihu, sị, ‘Gịnị mere unu ji busa nkume ndị a ebe a?’+ 7 unu ga-asị ha: ‘Nkume ndị a ga na-echetara ndị Izrel mgbe niile+ na e mere ka mmiri Jọdan kwụsị ịsọ asọ mgbe e bu igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova banye na ya. Mgbe e bu ya gafee n’etiti mmiri Jọdan, e mere ka mmiri Jọdan kwụsị ịsọ asọ.’”
-