19 Amarala m ya, amakwa m na ọ ga-enye ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya niile iwu ka ha na-eme ihe Jehova kwuru ma na-eme ihe dị mma na ihe ziri ezi,+ ka Jehova wee meere Ebreham ihe o kwere ya ná nkwa.”
6 Ihe ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị. 7 Kụziere ha ụmụ gị+ ka o ruo ha n’obi,* na-ekwukwa banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-aga ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.+