-
2 Ndị Eze 24:12, 13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Jehoyakin eze Juda, nne ya, ndị na-ejere ya ozi, ndị o mere ndị isi, na ndị na-eje ozi n’obí ya+ chịliiri eze Babịlọn aka+ elu, eze Babịlọn akpụrụkwa ya laa n’afọ nke asatọ eze Babịlọn malitere ịchị.+ 13 O bukọkwaara akụ̀ niile dị n’ụlọ Jehova na ndị nke dị n’ụlọ* eze,+ kụrisịakwa arịa niile Solomọn eze Izrel ji ọlaedo rụọ n’ụlọ nsọ Jehova.+ Ihe a niile mere otú Jehova kwuru na ha ga-eme.
-