-
2 Ihe E Mere 36:17-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 O mere ka eze ndị Kaldia gaa lụso ha agha,+ jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha+ n’ụlọ nsọ ha.+ O mereghị ma nwa okorobịa ma nwa agbọghọ, ma agadi ma onye na-adịkwaghị ike, ebere.+ Chineke nyefere ihe niile n’aka ya.+ 18 O buuru arịa niile dị n’ụlọ ezi Chineke, ma ndị nnukwu ma ndị obere, burukwa akụ̀ ndị dị n’ụlọ Jehova na akụ̀ eze nakwa nke ndị o mere ndị isi. O buuru ha niile laa Babịlọn.+ 19 Ọ gbara ụlọ ezi Chineke+ ọkụ, kwatuokwa mgbidi Jeruselem.+ Ọ gbara ụlọ elu niile a rụsiri ike na Jeruselem ọkụ, bibiekwa ihe niile bara uru dị na ya.+
-