6 “Mụnwa, bụ́ Jehova, akpọọla gị n’ihi na m na-eme ezi omume.
M serela gị n’aka.
M ga-echebe gị, meekwa ka ọ bụrụ gị ka mụ na ndị mmadụ ga-eji gbaa ndụ.+
M ga-emekwa ka ị bụrụ ìhè mba niile ji ahụ ụzọ,+
7 Ka i meghee anya ndị ìsì,+
Ka ị kpọpụta ndị mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ,
Meekwa ka ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị si n’ụlọ mkpọrọ pụta.+