2 “Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịa
Mgbe m ga-eme ka a nụ ụda opi agha ndị na-alụso Raba+ bụ́ obodo ndị Amọn+ agha.
Obodo ahụ ga-aghọ ebe e bibiri ebibi,
A ga-agbakwa ime obodo ndị dị ya nso ọkụ.’
Jehova kwukwara, sị, ‘Izrel ga-eweghara ala a napụrụ ya.’+