2Ndị a bụ ndị Juu si n’ógbè* ahụ, ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta,+ ya bụ, ndị Eze Nebukadneza nke Babịlọn dọọrọ n’agha laa Babịlọn.+ Ha mechara lọta Jeruselem na Juda, onye nke ọ bụla alaa n’obodo nke ya.+
25 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘M ga-akpọghachite ụmụ Jekọb a dọọrọ n’agha,+ meekwara ndị Izrel niile ebere.+ M ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mee ka a mara na aha m dị nsọ.+