-
1 Ihe E Mere 16:28-33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 Ezinụlọ dị iche iche, toonụ Jehova.
Toonụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa ike.+
29 Toonụ aha Jehova dị ebube.+
Jirinụ onyinye bịa ebe ọ nọ.+
Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.*+
30 Ndị niile bi n’ụwa, maanụ jijiji n’ihu ya.
E kesiri ụwa* ike. A gaghị ebupụli ya ebupụ.*+
31 Ka eluigwe ṅụrịa ọṅụ, ka ụwa nweekwa aṅụrị.+
Kọsaanụ ná mba dị iche iche, sị: ‘Jehova abụrụla Eze.’+
32 Ka oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya mee mkpọtụ.
Ka ọhịa na ihe niile dị n’ime ya ṅụrịa ọṅụ.
-