Job 36:26 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 26 N’eziokwu, Chineke dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata.+ E nweghị ike ịghọta* afọ ndụ ya.+ Malakaị 3:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 “N’ihi na abụ m Jehova; anaghị m agbanwe agbanwe.*+ Unu bụ ụmụ Jekọb; unu anwụchabeghị. Jems 1:17 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 Ọ bụ n’eluigwe ka anyị si enweta onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.+ Ọ na-esi n’aka Chineke, bụ́ Nna kere ìhè na-esi n’eluigwe, abịa.+ Chineke adịghị ka onyinyo na-anaghị anọ otu ebe, nke na-agbanwekwa agbanwe.+
17 Ọ bụ n’eluigwe ka anyị si enweta onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.+ Ọ na-esi n’aka Chineke, bụ́ Nna kere ìhè na-esi n’eluigwe, abịa.+ Chineke adịghị ka onyinyo na-anaghị anọ otu ebe, nke na-agbanwekwa agbanwe.+