-
Ọrụ Ndịozi 13:34-37Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ gaghị abụ mmadụ ọzọ, ọ gaghịkwa anwụ anwụ ma ọ bụ ree ure. Chineke gosiri na ihe a bụ eziokwu mgbe ọ sịrị: ‘M gaghị akwụsị ịhụ unu n’anya* otú ahụ m kwere Devid ná nkwa. E kwesịrị ịtụkwasị m obi na m ga-emezu nkwa a.’+ 35 O kwukwara ebe ọzọ n’abụ ọma, sị: ‘Ị gaghị ekwe ka onye jisiri gị aka ike ree ure.’+ 36 Devid mere ihe Chineke chọrọ n’oge nke ya, mechaa nwụọ, e lie ya otú e si lie ndị nna nna ya, ya ereekwa.+ 37 Ma, onye ahụ Chineke kpọlitere n’ọnwụ ereghị ure.+
-