-
Ezikiel 1:27, 28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 M hụrụ ihe yiri ọla na-egbu maramara+ ka ọkụ malite n’ihe yiri úkwù ya gbagoo. M hụkwara ihe yiri ọkụ, malite n’ihe yiri úkwù ya gbadaa.+ Ìhè na-enwu gburugburu ya 28 yiri eke na egwurugwu+ nke na-apụta n’ígwé ojii n’ụbọchị mmiri na-ezo. Ọ bụ otú ahụ ka ìhè nke na-enwu gburugburu ya dị. O yiri ebube Jehova.+ Mgbe m hụrụ ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala. M nụwakwara olu onye na-ekwu okwu.
-