-
Ọpụpụ 10:13-15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ozugbo ahụ, Mosis setịrị mkpara ya n’ala Ijipt, Jehova wee mee ka ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee n’ala ahụ n’ụbọchị ahụ niile nakwa n’abalị ahụ niile. Mgbe chi bọrọ, ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ butere igurube. 14 Igurube ndị ahụ febatara n’Ijipt niile ma ju ebe niile n’ala Ijipt.+ Ha karịrị akarị.+ E nwetụbeghị mgbe igurube juru eju otú a, e nweghịkwa mgbe a ga-enwe ya ọtụtụ otú a ọzọ. 15 Ha kpuchiri ala ahụ niile ma mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị. Ha richapụrụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala ahụ na mkpụrụ niile dị n’osisi ndị akụ́ mmiri ígwé na-emebighị. E nweghị ihe ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ fọrọ n’elu osisi ma ọ bụ n’ahịhịa dị n’ọhịa n’Ijipt niile.
-