5 Ọ bụghị maka na unu bụ ndị ezi omume ma ọ bụ maka na unu nwere ezigbo obi mere unu ji na-abanye ka unu biri n’ala ha. Kama, ọ bụ n’ihi ihe ọjọọ mba ndị a na-eme mere Jehova bụ́ Chineke unu ji na-achụpụrụ unu ha+ nakwa ka Jehova mezuo iyi ọ ṅụụrụ nna nna unu hà, bụ́ Ebreham,+ Aịzik,+ na Jekọb.+