-
Diuterọnọmi 7:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ọ ga-ahụ unu n’anya, gọzie unu ma mee ka unu mụbaa. Ọ ga-eme ka unu mụta ọtụtụ ụmụ.*+ Ọ ga-agọzikwa ihe unu kụrụ n’ala unu, ọka* unu, mmanya ọhụrụ unu, mmanụ unu,+ ụmụ ehi unu na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ unu, n’ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye unu.+ 14 Unu ga-abụ ndị a kacha gọzie agọzie n’ime ndị ọzọ niile.+ A gaghị enwe nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’ime unu na-agaghị amụta nwa. A gaghịkwa enwe anụ ụlọ unu na-agaghị amụta nwa.+
-