-
Aịzaya 40:29-31Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 Ọ na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike.
Ọ na-emekwa ka ume ju onye na-enweghị ume obi.+
30 Ụmụaka ndị nwoke ga-ada mbà. Ike ga-agwụkwa ha.
Ụmụ okorobịa ga na-adajọgharị, na-adarukwa ala.
31 Ma, ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike.
Ha ga-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo.+
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha.
Ha ga-eje ije, ma ha agaghị ada mbà.”+
-