-
2 Ihe E Mere 31:20, 21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Hezekaya mere ihe a n’ebe niile na Juda. Ọ nọkwa na-eme ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke ya. Ọ kwụsịghịkwa irubere ya isi. 21 O ji obi ya niile rụọ ọrụ niile gbasara ife Chineke ya, ma nke metụtara ozi a na-eje n’ụlọ ezi Chineke+ ma nke metụtara idebe iwu ya na iso ntụziaka ya. Ihe gazikwaara ya.
-