-
Jems 1:23-25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 N’ihi na ọ bụrụ na onye ọ bụla na-anụ okwu Chineke, ma ọ naghị eme ya eme,+ ọ dị ka onye lere ihu ya n’enyo, 24 leekwa onwe ya n’enyo, ma ozugbo ọ pụrụ, ya echefuo otú ọ dị. 25 Ma onye na-enyocha iwu Chineke, nke zuru okè,+ nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, onye na-emekwa ihe o kwuru, abụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ Chineke sị ka a rụọ. Ọ ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ na-arụ ya.+
-