Job 23:12 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 12 Akwụsịghị m idebe iwu si ya n’ọnụ. Eji m ihe ndị o kwuru kpọrọ ihe+ karịadị otú a chọrọ ka m mee. Abụ Ọma 119:174 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 174 Jehova, m na-atụsi anya ike ka ị zọpụta m. Iwu gị na-emekwa m obi ụtọ.+ Ndị Rom 7:22 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 22 N’ime obi m, iwu Chineke na-amasị m.+