Abụ Ọma 33:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 Ezi omume na ikpe ziri ezi na-amasị ya.+ Ịhụnanya* Jehova juru ebe niile n’ụwa.+ Abụ Ọma 104:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 Ọ na-esi n’ụlọ ya ndị dị n’elu agba ugwu dị iche iche mmiri.+ Ihe ndị ị na-emepụta na-ezuru ụwa.+