Abụ Ọma 51:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 51 Chineke, biko, meere m amara n’ihi ịhụnanya gị.*+ Hichapụ mmehie m n’ihi na ebere gị dị ukwuu.+ Abụ Ọma 103:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 Jehova emeerela ndị na-atụ egwu ya ebere+Otú nna si emere ụmụ ya ebere. Abụ Ọma 119:116 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 116 Nyere m aka otú i kwere m ná nkwa,*+Ka m wee dịrị ndụ. Ekwela ka ihe m na-atụ anya ya ghara imezu.*+ Daniel 9:18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 Chineke m, biko, gee m ntị ma nụrụ ihe m na-ekwu. Meghee anya gị hụrụ otú obodo anyị a kpọkwasịrị aha gị si tọgbọrọ chakoo. Anyị na-arịọ gị arịrịọ a maka na ị na-eme ebere nke ukwuu, ọ bụghị maka na anyị bụ ndị ezi omume.+ Luk 1:50 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 50 Sikwa n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ọ na-emere ndị na-atụ egwu ya ebere.+
116 Nyere m aka otú i kwere m ná nkwa,*+Ka m wee dịrị ndụ. Ekwela ka ihe m na-atụ anya ya ghara imezu.*+
18 Chineke m, biko, gee m ntị ma nụrụ ihe m na-ekwu. Meghee anya gị hụrụ otú obodo anyị a kpọkwasịrị aha gị si tọgbọrọ chakoo. Anyị na-arịọ gị arịrịọ a maka na ị na-eme ebere nke ukwuu, ọ bụghị maka na anyị bụ ndị ezi omume.+