-
1 Samuel 1:10, 11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 Obi jọrọ Hana ezigbo njọ, ya amalite ịrịọ Jehova arịrịọ,+ na-ebekwa ezigbo ákwá. 11 O kwekwara Chineke nkwa, sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, ọ bụrụ na ị hụ ahụ́ a na-emekpa mụnwa bụ́ ohu gị ma cheta m, gharakwa ichefu ohu gị ma nye ohu gị nwa nwoke,+ m ga-enye gị ya, Jehova, ka o jiri ndụ ya niile jeere gị ozi. Agụba agaghịkwa emetụ ya n’isi.”+
-
-
2 Samuel 16:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Devid gwakwara Abishaị na ndị niile na-ejere ya ozi, sị: “Ọ bụrụ na nwa m, onye bụ́ ọbara m,* na-achọ igbu m,+ ọ̀ bụzi onye ebo Benjamin bụ onye na-agaghị achọ igbu m?+ Hapụnụ ya ka ọ kpọwa m iyi, n’ihi na ọ bụ Jehova gwara ya kpọwa m iyi. 12 Jehova nwere ike hụ ahụhụ m na-ata.+ Jehova nwekwara ike mee ka iyi a a na-akpọ m taa ghọọ ngọzi.”+
-
-
Aịzaya 38:9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Hezekaya eze Juda dere ihe a mgbe ọ rịara ọrịa nke o mechara gbakee.
-
-
Aịzaya 38:20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Jehova, biko, bịa zọpụta m.
-