-
Jeremaya 33:8, 9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 M ga-asachapụ mmehie ha niile,+ gbagharakwa ha mmehie ha niile nakwa iwu m ha mebiri.+ 9 Ịnụ aha obodo a ga-eme ka m na-enwe aṅụrị. M ga-emekwa ka mba niile n’ụwa, ndị ga-anụ gbasara ihe ọma niile m na-emere ndị m,+ too m ma sọpụrụ m. Ha ga-atụ ụjọ, maakwa jijiji+ n’ihi ihe ọma niile m ga-emere ndị bi na ya na udo m ga-eme ka ọ dịrị na ya.’”+
-