-
Joshụa 12:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Ndị eze chịrị ala Joshụa na ndị Izrel meriri dị ọtụtụ. Ha meriri ndị bi n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan, malite na Bel-gad+ nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn,+ ruo n’Ugwu Helak,+ nke dị nso na Sia.+ Mgbe ha merichara ha, Joshụa nyere ebo Izrel niile ala ha ka ọ bụrụ ihe ha ketara. O kenyere ebo nke ọ bụla nke ruuru ya,+ 8 ma n’ebe bụ́ ugwu ugwu, ma na Shefila,* ma n’Araba, ma ebe ndị dị ná mkpọda, ma n’ala ịkpa, ma na Negeb.*+ Ala ndị a bụ ala ndị Het, na nke ndị Amọraịt,+ na nke ndị Kenan, na nke ndị Perizaịt, na nke ndị Haịvaịt nakwa nke ndị Jebus.+ Ndị a bụ ndị eze ha meriri:
-