-
Jenesis 20:6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ezi Chineke wee sị ya ná nrọ: “Ama m na i bughị ihe ọjọọ n’obi mee ihe a. Ọ bụ ya mere m ji gbochie gị imehie m. Ọ bụ ya mere na ekweghị m ka i metụ ya aka.
-
-
2 Ihe E Mere 26:16-18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Ma ozugbo o siri ike, ọ bịara dị mpako, si otú ahụ kpatara onwe ya nsogbu. O mebiri iwu Jehova Chineke ya, banye n’ụlọ nsọ Jehova ka ọ mụnye insens* ọkụ n’elu ebe ịchụàjà insens.+ 17 Ma, Azaraya onye nchụàjà na ndị nchụàjà Jehova iri asatọ ndị ọzọ, ndị katara obi, sochiri ya azụ ozugbo. 18 Ha gakwuuru Eze Ọzaya, sị ya: “Ọzaya, ọ bụghị gị kwesịrị ịmụnyere Jehova insens ọkụ.+ Ọ bụ naanị ndị nchụàjà kwesịrị ịna-amụnye insens ọkụ, n’ihi na ha bụ ụmụ ụmụ Erọn,+ ndị e doro nsọ. Si n’ụlọ nsọ a pụọ, n’ihi na i meela ihe ọjọọ. Jehova Chineke agaghị eme ka a kwanyere gị ùgwù n’ihi ihe a i mere.”
-