-
Ezikiel 34:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 M ga-esi ná mba dị iche iche kpọkọta ha, sikwa n’ala dị iche iche chịkọta ha ma kpọlata ha n’ala ha. M ga-azụkwa ha n’ugwu ndị dị n’Izrel,+ n’akụkụ iyi dị iche iche, nakwa n’ebe niile ndị mmadụ bi. 14 M ga-azụ ha n’ebe dị mma anụmanụ na-ata ahịhịa. Ha ga na-atakwa ahịhịa n’ugwu ndị dị n’Izrel.+ N’ebe ahụ dị mma ahịhịa juru ka ha ga-amakpu.+ Ha ga-atakwa ahịhịa n’ebe dị ezigbo mma anụmanụ na-ata ahịhịa n’ugwu ndị dị n’Izrel.”
-