-
1 Samuel 19:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Jonatan wee gwa Sọl nna ya okwu ọma gbasara Devid.+ Ọ gwara ya, sị: “Eze, i kwesịghị ime ohu gị Devid ihe ọjọọ ọ bụla,* n’ihi na o nweghị ihe o mere gị. Ihe niile o meere gị baara gị uru. 5 O mere ihe gaara ata isi ya iji gbuo onye Filistia ahụ o gburu.+ Jehova sikwa otú ahụ mee ka Izrel niile merie ezigbo mmeri. Ị hụrụ ya, obi abụrụ gị sọ aṅụrị. Gịnịzi mere ị ga-eji mee onye aka ya dị ọcha ihe ọjọọ? Gịnị mere ị ga-eji gbuo Devid n’enweghị ihe o mere?”+
-