32 Devid wee sị Abigel: “Too Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye zitere gị taa ka ị bịa hụ m. 33 Ka Chineke gọzie gị maka otú a i si gosi na ị ma ihe. Ka ọ gọziekwa gị maka otú i si mee ka ikpe ọbara ghara ịma m+ nakwa otú i si mee ka m ghara iji aka m megwara ihe e mere m.