-
1 Samuel 25:30, 31Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
30 Ọ bụrụkwa na Jehova emeere onyenwe m ihe ọma ndị o kwere nkwa imere ya, họpụtakwa gị ka ị bụrụ onye ndú Izrel,+ 31 ị gaghị akwa mmakwaara ma ọ bụ kwaa ụta ị gaara akwa n’obi gị ma a sị na i gburu* onye aka ya dị ọcha ma ọ bụ ma a sị na onyenwe m ji aka ya megwara ihe e mere ya.*+ Biko, onyenwe m, chetakwa ohu gị nwaanyị mgbe Jehova ga-emere gị ihe ọma.”
-
-
Esta 5:8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Ọ bụrụ na ihe m masịrị eze, ọ bụrụkwa na ọ dị eze mma imere m ihe m chọrọ na ime ihe m na-arịọ, ka eze na Heman bịa oriri m ga-emere ha echi. Ọ bụkwa echi ahụ ka m ga-agwa eze ihe ọ chọrọ ka m gwa ya.”
-
-
Taịtọs 2:3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Ka ndị agadi nwaanyị na-akpa àgwà gosiri na ha na-asọpụrụ Chineke, ghara ịna-ekwutọ ndị ọzọ, ghara ịna-aṅụ oké mmanya, ka ha na-akụzi ihe dị mma,
-