16 Ana m eme ka unu mata Fibi, nwanna anyị nwaanyị, onye na-eje ozi n’ọgbakọ dị na Senkrea,+ 2 ka unu wee nabata ya n’aha Onyenwe anyị otú e kwesịrị isi anabata ndị nsọ ma nyere ya aka n’ihe ọ bụla o nwere ike ịchọ ka unu nyere ya aka,+ n’ihi na yanwa agbachiterela ọtụtụ ndị, ma mụnwa.