-
Diuterọnọmi 32:45-47Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
45 Mgbe Mosis gwachara ndị Izrel niile ihe a niile, 46 ọ sịrị ha: “Burunụ okwu niile m ji na-adọ unu aka ná ntị taa n’obi,+ ka unu wee nye ụmụ unu iwu ka ha lezie anya na-eme ihe niile e kwuru n’Iwu a.+ 47 N’ihi na ọ bụghị okwu na-agaghị abara unu uru, kama ọ bụ okwu ga-eme ka unu dị ndụ.+ Okwu a ga-emekwa ka unu bitee aka n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu nweta.”
-
-
Ndị Hibru 12:11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 N’eziokwu, e nweghị ịdọ aka ná ntị na-eme mmadụ obi ụtọ mgbe a na-adọ ya onye ahụ, kama ọ na-ewute ewute. Ma e mechaa, ọ na-abara ndị e ji ya zụọ ezigbo uru. Ha ga na-eme ezi omume, obi eruokwa ha ala.
-